Native Bible

Jeremiah 52:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn.

Jeremiah 52:32 in English

Jeremiah 52:32 · Berean Standard Bible

And he spoke kindly to Jehoiachin and set his throne above the thrones of the other kings who were with him in Babylon.

Context

30Nʼafọ nke iri abụọ na atọ, Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ. Ọnụọgụgụ ha niile dị puku anọ na narị isii, 4,600. 31Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ. 32Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn. 33Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 34Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya. 52:7 Maọbụ, Kaldịa 52:7 Ya bụ ndagwurugwu Jọdan 52:8 Kaldịa dịkwa nʼamaokwu nke 14 na 17 52:16 Ya bụ ndị dakarịsịrị nʼogbenye 52:21 Iri nzọ ụkwụ abụọ na asaa 52:21 Nzọ ụkwụ iri na asatọ 52:22 Ya bụ nzọ ụkwụ asaa na ọkara

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.