Jeremaya 52:22
Jeremiah 52:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ* nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
Jeremiah 52:22 in English
Jeremiah 52:22 · Berean Standard Bible
The bronze capital atop one pillar was five cubits high,* with a network of bronze pomegranates all around. The second pillar, with its pomegranates, was similar.
Context
20O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ. 21Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma* nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ,* nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha. 22Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ* nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya. 23Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị. 24Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.