Native Bible

Jeremiah 52:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.

Jeremiah 52:2 in English

Jeremiah 52:2 · Berean Standard Bible

And Zedekiah did evil in the sight of the LORD, just as Jehoiakim had done.

Context

1Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna. 2O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere. 3Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn. 4Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.