Jeremaya 50:1
Jeremiah 50:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.
Jeremiah 50:1 in English
Jeremiah 50:1 · Berean Standard Bible
This is the word that the LORD spoke through Jeremiah the prophet concerning Babylon and the land of the Chaldeans:*
Context
1Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn. 2“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya;
bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya.
Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị,
‘A ga-adọta Babilọn nʼagha.
Ihere ga-emesịa mee Bel;
otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi.
A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ;
oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’ 3Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha,
mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya,
nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.