Native Bible

Jeremiah 44:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.

Jeremiah 44:25 in English

Jeremiah 44:25 · Berean Standard Bible

This is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: As for you and your wives, you have spoken with your mouths and fulfilled with your hands your words: ‘We will surely perform our vows that we have made to burn incense to the Queen of Heaven and to pour out drink offerings to her.’ Go ahead, then, do what you have promised! Keep your vows!

Context

23Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.” 24Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt. 25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ. 26Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.” 27Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.