Native Bible

Jeremiah 44:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”

Jeremiah 44:23 in English

Jeremiah 44:23 · Berean Standard Bible

Because you burned incense and sinned against the LORD, and did not obey the voice of the LORD or walk in His instruction, His statutes, and His testimonies, this disaster has befallen you, as you see today.”

Context

21“Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile. 22Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa. 23Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.” 24Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt. 25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.