Jeremaya 44:21
Jeremiah 44:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.
Jeremiah 44:21 in English
Jeremiah 44:21 · Berean Standard Bible
“As for the incense you burned in the cities of Judah and in the streets of Jerusalem—you, your fathers, your kings, your officials, and the people of the land—did the LORD not remember and bring this to mind?
Context
19Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?” 20Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha, 21“Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile. 22Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa. 23Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.