Native Bible

Jeremiah 44:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha,

Jeremiah 44:20 in English

Jeremiah 44:20 · Berean Standard Bible

Then Jeremiah said to all the people, both men and women, who were answering him,

Context

18Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.” 19Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?” 20Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha, 21“Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile. 22Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.