Native Bible

Jeremiah 44:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros,

Jeremiah 44:1 in English

Jeremiah 44:1 · Berean Standard Bible

This is the word that came to Jeremiah concerning all the Jews living in the land of Egypt *—in Migdol, Tahpanhes, and Memphis *—and in the land of Pathros:*

Context

1Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha. 3Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.