Native Bible

Jeremiah 44:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha.

Jeremiah 44:2 in English

Jeremiah 44:2 · Berean Standard Bible

“This is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: You have seen all the disaster that I brought against Jerusalem and all the cities of Judah; and behold, they lie today in ruins and desolation

Context

1Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha. 3Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị. 4Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.