Native Bible

Jeremiah 39:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”

Jeremiah 39:12 in English

Jeremiah 39:12 · Berean Standard Bible

“Take him, look after him, and do not let any harm come to him; do for him whatever he says.”

Context

10Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile. 11Ugbu a, Nebukadneza eze Babilọn enyelarị Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze iwu banyere Jeremaya, sị, 12“Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.” 13Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn, 14ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.