Native Bible

Jeremiah 36:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”

Jeremiah 36:29 in English

Jeremiah 36:29 · Berean Standard Bible

You are to proclaim concerning Jehoiakim king of Judah that this is what the LORD says: You have burned the scroll and said, ‘Why have you written on it that the king of Babylon would surely come and destroy this land and deprive it of man and beast?’

Context

27Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya: 28“Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ. 29Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?” 30Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya. 31Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.