Jeremaya 36:27
Jeremiah 36:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya:
Jeremiah 36:27 in English
Jeremiah 36:27 · Berean Standard Bible
After the king had burned the scroll containing the words that Baruch had written at Jeremiah’s dictation, the word of the LORD came to Jeremiah:
Context
25Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị. 26Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha. 27Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya: 28“Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ. 29Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.