Native Bible

Jeremiah 36:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị,

Jeremiah 36:1 in English

Jeremiah 36:1 · Berean Standard Bible

In the fourth year of Jehoiakim son of Josiah king of Judah, this word came to Jeremiah from the LORD:

Context

1Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị, 2“Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a. 3Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.