Jeremaya 36:3
Jeremiah 36:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”
Jeremiah 36:3 in English
Jeremiah 36:3 · Berean Standard Bible
Perhaps when the people of Judah hear about all the calamity I plan to bring upon them, each of them will turn from his wicked way. Then I will forgive their iniquity and their sin.”
Context
1Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị, 2“Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a. 3Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.” 4Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ. 5Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.