Jeremaya 35:2
Jeremiah 35:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
Jeremiah 35:2 in English
Jeremiah 35:2 · Berean Standard Bible
“Go to the house of the Rechabites, speak to them, and bring them to one of the chambers of the house of the LORD to offer them a drink of wine.”
Context
1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya, 2“Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.” 3Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile. 4Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.