Jeremaya 35:3
Jeremiah 35:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile.
Jeremiah 35:3 in English
Jeremiah 35:3 · Berean Standard Bible
So I took Jaazaniah son of Jeremiah, the son of Habazziniah, and his brothers and all his sons—the entire house of the Rechabites—
Context
1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya, 2“Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.” 3Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile. 4Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ. 5Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.