Native Bible

Jeremiah 32:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Babilọn ahụ na-ebuso obodo a agha, ga-abata nʼime ya, kpọọ ya ọkụ. Ha ga-akpọ ya ọkụ, ya na ụlọ niile dị nʼime ya, bụ ụlọ niile ahụ ndị bi nʼime ya nọ kpasuo m iwe, site nʼisure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi Baal nʼelu ụlọ ha niile, na site nʼịwụsara chi ndị ọzọ onyinye ihe ọṅụṅụ.

Jeremiah 32:29 in English

Jeremiah 32:29 · Berean Standard Bible

And the Chaldeans who are fighting against this city will come in, set it on fire, and burn it, along with the houses of those who provoked Me to anger by burning incense to Baal on their rooftops and by pouring out drink offerings to other gods.

Context

27“Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime? 28Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ejikerela m ugbu a inyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, na nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, onye ga-alụta ya nʼagha. 29Ndị Babilọn ahụ na-ebuso obodo a agha, ga-abata nʼime ya, kpọọ ya ọkụ. Ha ga-akpọ ya ọkụ, ya na ụlọ niile dị nʼime ya, bụ ụlọ niile ahụ ndị bi nʼime ya nọ kpasuo m iwe, site nʼisure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi Baal nʼelu ụlọ ha niile, na site nʼịwụsara chi ndị ọzọ onyinye ihe ọṅụṅụ. 30“Ọ bụ naanị ihe ọjọọ ka ndị Izrel na ndị Juda mere nʼihu m site na mgbe ha bụ nwantakịrị. Nʼezie, ha esitela nʼihe ha ji aka mee kpasuo m iwe, ka Onyenwe anyị kwuru. 31Site nʼoge e wuru ya ruo ugbu a, ndị bi nʼobodo a akpaliela iwe m na ọnụma m. Ya mere, aga m esite nʼihu m wezuga ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.