Jeremaya 32:27
Jeremiah 32:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime?
Jeremiah 32:27 in English
Jeremiah 32:27 · Berean Standard Bible
“Behold, I am the LORD, the God of all flesh. Is anything too difficult for Me?
Context
25Ma ọ bụ ezie na a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, ma gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gwara m sị, ‘Were ọlaọcha zụta ala ahụ. Zụkwaa ya nʼihu ndị akaebe.’ ” 26Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 27“Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime? 28Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ejikerela m ugbu a inyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, na nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, onye ga-alụta ya nʼagha. 29Ndị Babilọn ahụ na-ebuso obodo a agha, ga-abata nʼime ya, kpọọ ya ọkụ. Ha ga-akpọ ya ọkụ, ya na ụlọ niile dị nʼime ya, bụ ụlọ niile ahụ ndị bi nʼime ya nọ kpasuo m iwe, site nʼisure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi Baal nʼelu ụlọ ha niile, na site nʼịwụsara chi ndị ọzọ onyinye ihe ọṅụṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.