Native Bible

Jeremiah 32:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị,

Jeremiah 32:16 in English

Jeremiah 32:16 · Berean Standard Bible

After I had given the deed of purchase to Baruch son of Neriah, I prayed to the LORD:

Context

14‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge. 15Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’ 16“Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị, 17“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime. 18Ị na-egosi ịhụnanya nye ọtụtụ puku ndị mmadụ ma na-eweta ịta ahụhụ nye ụmụ site nʼihi mmehie nna ha. O Chineke dị ukwuu dịkwa ike, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.