Jeremaya 32:14
Jeremiah 32:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge.
Jeremiah 32:14 in English
Jeremiah 32:14 · Berean Standard Bible
“This is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: Take these deeds—both the sealed copy and the open copy of the deed of purchase—and put them in a clay jar to preserve them for a long time.
Context
12nyefee ha nʼaka Baruk nwa Neraya, nwa Mahseia, nʼihu Hanamel nwanna m, na nʼihu ndị akaebe ndị ọzọ, ndị aka ha dị nʼakwụkwọ ahụ, na nʼihu ndị Juu ndị ọzọ, ndị nọ nʼogige ụlọ ndị agha ahụ. 13“Nʼihu ha, enyere m Baruk iwu ndị a sị ya, 14‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge. 15Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’ 16“Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.