Native Bible

Jeremiah 32:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ.

Jeremiah 32:10 in English

Jeremiah 32:10 · Berean Standard Bible

I signed and sealed the deed, called in witnesses, and weighed out the silver on the scales.

Context

8“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị. 9Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ. 10Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ. 11Eweere m akwụkwọ ịzụta ala ahụ a kara akara, nke a nyachikwara anyachi, ebe e dere ihe banyere ọzụzụ na orire nke ala ahụ, werekwa ụdị akwụkwọ ahụ nke a na-anyachighị anyachi, 12nyefee ha nʼaka Baruk nwa Neraya, nwa Mahseia, nʼihu Hanamel nwanna m, na nʼihu ndị akaebe ndị ọzọ, ndị aka ha dị nʼakwụkwọ ahụ, na nʼihu ndị Juu ndị ọzọ, ndị nọ nʼogige ụlọ ndị agha ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.