Jeremaya 32:9
Jeremiah 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ.
Jeremiah 32:9 in English
Jeremiah 32:9 · Berean Standard Bible
So I bought the field in Anathoth from my cousin Hanamel, and I weighed out seventeen shekels of silver.*
Context
7Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’ 8“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’
“Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị. 9Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ. 10Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ. 11Eweere m akwụkwọ ịzụta ala ahụ a kara akara, nke a nyachikwara anyachi, ebe e dere ihe banyere ọzụzụ na orire nke ala ahụ, werekwa ụdị akwụkwọ ahụ nke a na-anyachighị anyachi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.