Jeremaya 29:18
Jeremiah 29:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ.
Jeremiah 29:18 in English
Jeremiah 29:18 · Berean Standard Bible
I will pursue them with sword and famine and plague. I will make them a horror to all the kingdoms of the earth—a curse, a desolation, and an object of scorn and reproach among all the nations to which I banish them.
Context
16Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere eze ahụ na-anọkwasị nʼocheeze Devid, na banyere ndị mmadụ niile fọdụrụ nʼobodo a, bụ ụmụnne unu ndị ahụ na-esoghị unu gaa ebe e mere ka ha ga biri na mba ọzọ. 17E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata. 18Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ. 19Nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, bụ okwu si nʼọnụ ndị ohu m bụ ndị amụma, ndị m zigaara ha mgbe mgbe. Ma unu onwe unu, ndị bi na mba ọzọ egekwaghị ntị nʼokwu m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 20Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha gaa Babilọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.