Jeremaya 29:17
Jeremiah 29:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata.
Jeremiah 29:17 in English
Jeremiah 29:17 · Berean Standard Bible
this is what the LORD of Hosts says: “I will send against them sword and famine and plague, and I will make them like rotten figs, so bad they cannot be eaten.
Context
15Unu pụrụ ị sị, “Onyenwe anyị akpọlite ndị amụma nye anyị na Babilọn.” 16Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere eze ahụ na-anọkwasị nʼocheeze Devid, na banyere ndị mmadụ niile fọdụrụ nʼobodo a, bụ ụmụnne unu ndị ahụ na-esoghị unu gaa ebe e mere ka ha ga biri na mba ọzọ. 17E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata. 18Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ. 19Nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, bụ okwu si nʼọnụ ndị ohu m bụ ndị amụma, ndị m zigaara ha mgbe mgbe. Ma unu onwe unu, ndị bi na mba ọzọ egekwaghị ntị nʼokwu m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.