Jeremaya 25:36
Jeremiah 25:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.
Jeremiah 25:36 in English
Jeremiah 25:36 · Berean Standard Bible
Hear the cry of the shepherds, the wailing of the leaders of the flock, for the LORD is destroying their pasture.
Context
34Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa;
tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ.
Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola,
unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja. 35Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ;
ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha. 36Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ,
geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ,
nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha. 37Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị. 38Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa.
Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe,
nʼihi mma agha nke onye mmegbu,
na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.