Jeremaya 25:2
Jeremiah 25:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
Jeremiah 25:2 in English
Jeremiah 25:2 · Berean Standard Bible
So the prophet Jeremiah spoke to all the people of Judah and all the residents of Jerusalem as follows:
Context
1Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn. 2Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem: 3Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu. 4Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.