Jeremaya 22:28
Jeremiah 22:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?
Jeremiah 22:28 in English
Jeremiah 22:28 · Berean Standard Bible
Is this man Coniah a despised and shattered pot, a jar that no one wants? Why are he and his descendants hurled out and cast into a land they do not know?
Context
26Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ. 27Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.” 28Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị,
ihe onye ọbụla na-achọghị?
Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya,
tụga ha na mba ha na-amaghị? 29Ala, ala, ala,
nụrụ okwu Onyenwe anyị. 30Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa,
nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile,
nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma,
o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid,
maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”
22:14 Ya bụ, mgba
22:23 Nke a bụ ụlọeze ahụ dị na Jerusalem, hụ nke a na 1Ez 7:2
22:23 Akwụkwọ ndị ọzọ ga-ede; lee ka ị si bụrụ onye a ga-emere ebere mgbe ihe mgbu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.