Native Bible

Jeremiah 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.

Jeremiah 21:11 in English

Jeremiah 21:11 · Berean Standard Bible

Moreover, tell the house of the king of Judah to hear the word of the LORD.

Context

9Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. 10Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’ 11“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. 12Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi* kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị. 13Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem, gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a, onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha? Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.