Jeremaya 21:11
Jeremiah 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.
Jeremiah 21:11 in English
Jeremiah 21:11 · Berean Standard Bible
Moreover, tell the house of the king of Judah to hear the word of the LORD.
Context
9Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. 10Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’ 11“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. 12Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi* kwa ụtụtụ niile;
napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha.
Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a.
Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu,
dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu,
ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị. 13Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem,
gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a,
onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha?
Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.