Jeremaya 18:21
Jeremiah 18:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.
Jeremiah 18:21 in English
Jeremiah 18:21 · Berean Standard Bible
Therefore, hand their children over to famine; pour out the power of the sword upon them. Let their wives become childless and widowed; let their husbands be slain by disease, their young men struck down by the sword in battle.
Context
19Gee m ntị, Onyenwe anyị.
Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m. 20O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma?
Ma lee na ha egwuolara m olulu.
Chetakwa na m guzooro nʼihu gị
ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha.
Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe. 21Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ.
Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha.
Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di.
Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha,
ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha. 22Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa,
mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede.
Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m,
ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ. 23Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị,
maara nzube ọjọọ ha niile igbu m.
Agbagharala ha ajọ omume ha;
maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị.
Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị;
mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.
18:18 Maọbụ, gwajuo ya okwu afọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.