Jeremaya 18:19
Jeremiah 18:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.
Jeremiah 18:19 in English
Jeremiah 18:19 · Berean Standard Bible
Attend to me, O LORD. Hear what my accusers are saying!
Context
17Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha
dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ.
Aga m agbakụta ha azụ.
Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.” 18Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha,* gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.” 19Gee m ntị, Onyenwe anyị.
Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m. 20O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma?
Ma lee na ha egwuolara m olulu.
Chetakwa na m guzooro nʼihu gị
ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha.
Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe. 21Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ.
Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha.
Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di.
Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha,
ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.