Jeremaya 18:2
Jeremiah 18:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.”
Jeremiah 18:2 in English
Jeremiah 18:2 · Berean Standard Bible
“Go down at once to the potter’s house, and there I will reveal My message to you.”
Context
1Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2“Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.” 3Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe. 4Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.