Jeremaya 18:4
Jeremiah 18:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.
Jeremiah 18:4 in English
Jeremiah 18:4 · Berean Standard Bible
But the vessel that he was shaping from the clay became flawed in his hand; so he formed it into another vessel, as it seemed best for him to do.
Context
2“Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.” 3Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe. 4Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya. 5Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, 6Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.