Jeremaya 17:19
Jeremiah 17:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.
Jeremiah 17:19 in English
Jeremiah 17:19 · Berean Standard Bible
This is what the LORD said to me: “Go and stand at the gate of the people, through which the kings of Judah go in and out; and stand at all the other gates of Jerusalem.
Context
17A ghọrọla m ihe na-eyi egwu,
nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi. 18Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m.
Ekwekwala ka ihere mee m.
Mee ka ha tụọ ụjọ,
ma chebe m site nʼihe egwu.
Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha,
werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha. 19Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem. 20Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’ 21Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.