Native Bible

Jeremiah 16:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ,* maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 16:5 in English

Jeremiah 16:5 · Berean Standard Bible

Indeed, this is what the LORD says: “Do not enter a house where there is a funeral meal. Do not go to mourn or show sympathy, for I have removed from this people My peace, My loving devotion, and My compassion,” declares the LORD.

Context

3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a. 4“Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.” 5Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ,* maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha. 7O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.