Native Bible

Jeremiah 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha.

Jeremiah 16:6 in English

Jeremiah 16:6 · Berean Standard Bible

“Both great and small will die in this land. They will not be buried or mourned, nor will anyone cut himself or shave his head for them.

Context

4“Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.” 5Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ,* maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha. 7O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi. 8“Abanyekwala nʼụlọ ebe e nwere oriri soro ndị nọ nʼebe ahụ nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.