Jeremaya 16:3
Jeremiah 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.
Jeremiah 16:3 in English
Jeremiah 16:3 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says concerning the sons and daughters born in this place, and the mothers who bore them, and the fathers who fathered them in this land:
Context
1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.” 3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a. 4“Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.” 5Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ,* maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.