Ndị Ikpe 9:21
Judges 9:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya.
Judges 9:21 in English
Judges 9:21 · Berean Standard Bible
Then Jotham ran away, escaping to Beer, and he lived there for fear of his brother Abimelech.
Context
19Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ. 20Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.” 21Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya. 22Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel, 23Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.