Native Bible

Judges 9:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.”

Judges 9:20 in English

Judges 9:20 · Berean Standard Bible

But if not, may fire come from Abimelech and consume the leaders of Shechem and Beth-millo, and may fire come from the leaders of Shechem and Beth-millo and consume Abimelech.”

Context

18Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu. 19Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ. 20Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.” 21Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya. 22Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.