Ndị Ikpe 9:18
Judges 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu.
Judges 9:18 in English
Judges 9:18 · Berean Standard Bible
but you have risen up against my father’s house this day and killed his seventy sons on a single stone, and you have made Abimelech, the son of his maidservant, king over the leaders of Shechem because he is your brother—
Context
16“Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere Abimelek eze? Mmeso unu mesoro Jerub-Baal na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya? 17Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị Midia. 18Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu. 19Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ. 20Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.