Ndị Ikpe 6:7
Judges 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha,
Judges 6:7 in English
Judges 6:7 · Berean Standard Bible
Now when the Israelites cried out to the LORD because of Midian,
Context
5Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya. 6Site nʼomume ọjọọ ndị a, e mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị dara ụbịam nke ukwuu nʼihi ọchịchị ndị Midia. Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. 7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha, 8Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu. 9Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.