Native Bible

Judges 3:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.

Judges 3:29 in English

Judges 3:29 · Berean Standard Bible

At that time they struck down about ten thousand Moabites, all robust and valiant men. Not one of them escaped.

Context

27Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha. 28Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee. 29Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ. 30Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ. 31Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel. 3:6 Ọpụ 34:15-16; Dit 7:3-4; Jos 23:12 3:13 Ndị Amọn bụ ndị si nʼagbụrụ Lọt, nke a dị nʼakwụkwọ Jen 19:38, ebe ndị Amalek si nʼagbụrụ Ịsọ (ị ga-agụta nke a nʼakwụkwọ Jen 36:12,16). Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị agbataobi ndị Izrel, ma ha bụ ndị iro ka ndị iro niile nke ndị Izrel nwere (gụọ Dit 25:17-18).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.