Ndị Ikpe 21:11
Judges 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.”
Judges 21:11 in English
Judges 21:11 · Berean Standard Bible
This is what you are to do: Devote to destruction * every male, as well as every female who has had relations with a man.”
Context
9Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa. 10Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị. 11Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.” 12Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha. 13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.