Ndị Ikpe 20:44
Judges 20:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.
Judges 20:44 in English
Judges 20:44 · Berean Standard Bible
And 18,000 Benjamites fell, all men of valor.
Context
42Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ. 43Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ. 44Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ. 45Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ. 46Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.