Ndị Ikpe 20:42
Judges 20:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ.
Judges 20:42 in English
Judges 20:42 · Berean Standard Bible
So they fled before the men of Israel toward the wilderness, but the battle overtook them, and the men coming out of the cities struck them down there.
Context
40Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ. 41Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha. 42Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ. 43Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ. 44Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.