Ndị Ikpe 2:12
Judges 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.
Judges 2:12 in English
Judges 2:12 · Berean Standard Bible
Thus they forsook the LORD, the God of their fathers, who had brought them out of the land of Egypt, and they followed after various gods of the peoples around them. They bowed down to them and provoked the LORD to anger,
Context
10Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị Onyenwe anyị maọbụ ihe ndị nke o mere* nye ụmụ Izrel. 11Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe. 12Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. 13Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.* 14Ya mere, Onyenwe anyị* were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.