Ndị Ikpe 13:4
Judges 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.
Judges 13:4 in English
Judges 13:4 · Berean Standard Bible
Now please be careful not to drink wine or strong drink, and not to eat anything unclean.
Context
2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. 3Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. 4Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ. 5Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya,* nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.” 6Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.