Ndị Ikpe 13:2
Judges 13:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
Judges 13:2 in English
Judges 13:2 · Berean Standard Bible
Now there was a man from Zorah named Manoah, from the clan of the Danites, whose wife was barren and had no children.
Context
1Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ. 2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. 3Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. 4Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.