Native Bible

Judges 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”

Judges 13:12 in English

Judges 13:12 · Berean Standard Bible

Then Manoah asked, “When your words come to pass, what will be the boy’s rule of life and mission?”

Context

10Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!” 11Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.” 12Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?” 13Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya. 14Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị,* maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.