Ndị Ikpe 11:6
Judges 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”
Judges 11:6 in English
Judges 11:6 · Berean Standard Bible
“Come,” they said, “be our commander, so that we can fight against the Ammonites.”
Context
4O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha. 5Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob. 6Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.” 7Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị,* ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?” 8Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.